Illustrations by Moussa Kone

Ụtụ Ojii

by Masimba Musodza

First published as “Black Tax” at Agbowo.org. November 30, 2022

Translated into Igbo by Yvonne Chioma Mbanefo
Share:
  • Download:
 

Narrated in Igbo by Yvonne Chioma Mbanefo.

Ka o si n'ọnụ ụzọ ihu úlọ dị n’ụlọ nlekọta Sotherdon Hall Care Home pụta n'ime ụtụtụ oyi gbara ọchịchịrị, Petronella chetara ịgbali ụda dị na ekwentị ya. Ọ ga-achọ ya ma ọ bụrụ na o nwere olile anya ịnụ mkpu ọkpọoku ahụ mgbe oge ruru ịlaghachi ma emechaa taa maka ọrụ awa 12 ọzọ. Enwere oku azaghị aza iri abụọ na isii na WhatsApp, ha niile sitere na nọmba ndị Zimbabwe na-amaghị ama. Obi ya dagharịrị. Ọ ghaghị ịbụ akụkọ ọjọọ sitere n'ụlọ.

"Ugbua ị gaghị echere m o, 'Nel!" Chimaobi kwuru, ka o si n'ụlọ nlekọta ahụ pụta wee danye n’ije n'akụkụ ya. “Fred na-ehi ụra. A gbara m mbọ hụ na ọ deghị ede.” Ọ makụrụ onwe ya n'ubu ka oke oyi na-atụ metụtara ya. "Ebee ka Cat nọ?"

"N’uche nke m, oge ya eruola n’ịme leeti," Petronella kwuru, ka onye uche ya adịghị ebe ahụ. "Ọ dị ka ọrụ akarịrị akarị n’elụ ọkwa ụlọ nke abụọ n'abalị niile."

Ka ha na-amikpu n'ime ụgbọala Kia dị nta, Petronella gbanyere injin ahụ iji mee ka ụgbọ ala kpotu ọkụ, ma weghachi uche ya na ọnụọgụ dị omimi dị na ndepụta oku azaghị aza ya ma na-eche ihe ọ ga-ebute. Ọ gbara onwe ya ume, wee kpọghachie ya. A zara ekwentị ya ozugbo site n'olu nwanyị ọ maara nke ọma. "Ndeewo, Mai Paida !". Nne nke Paida a kpọrọ ya mere ka ụjọ jide ya, ume wee jide ya n'olu. "Ọ bụ m, Gogo VaPaida ."

Nne ochie Paida. Nne nna Paida , ma akpọrụe ya n’isi. Nne di Petronella. Ọ kpọnubeghi ya n’ekwentị, Petronella na-enwetakarị ekele na-enweghị isi n’aka ya tupu ya na nwa ya nwoke bụ Greg emechiwe nkata weere otu ogologo awa. Petronella maara site na mmekọrịta ha - ma ọ bụ ụkọ mmekọrịta ha - na ọ bụrụ na o nwere ozi ọjọọ, ọ ga-akpọ Greg gwa ya. "Oh, ọ bụ Amai!" Petronella kwuru, na-atụ anya na ụda olu ya ọ dị ka ọ nwere ọbị aṅụrị ịnụ ọlụ nne di ya.

“Mmm , o siri ike ịnweta gị, nwa m nwaanyị,” nne nna Paida kwuru. Petronella ji uche hụ ka ọ na-efe isi ya na mba. "E bidola m iche na Baba VaPaida nyere m nọmba na-ezighi ezi."

"Anọ m n'ọrụ abalị niile, Amai," Petronella kwuru. “A ka m rụchara, wee hụkwa oku m na-azaghị. Mmadụ niile ọ dị mma na Zimbabwe?"

“Mmadụ niile dị mma, ada m,” ka o kwuru. "Enweghị m ọtụtụ oge , ị maara ka otú ngwugwu data sị dị oke ọnụ ebe a. Ụnyaahụ, a nọ m na Chitungwiza, kọmitii ụlọụka anyị nọ na ogbako. A kpọtụụrụ m ndị mụrụ gị ebe ọ bụ na m nọ n’ógbè ahụ.”

"Oh, kedu ka ha mere?" Petronella kwuru, na-agbalịsi ike ime ka olu ya na-ada ọfụma. Afọ isii nke ịlụ nwa ya nwoke akụziela ya na nne nna Paida anaghị anọgide kpọọ onye ọbụla.

Paida kwuru, sị: “A hụrụ m na ha arụnyela ogwe ọkụ anyanwụ ọhụrụ.

"Oh.. " Petronella hụrụ ka olụ ya bidoro na-ama jijiji. "Eee, Amai, ị maara ka ọ dị na mpaghara ebe mmadụ jupụtara, ọkụ latrik aghọla ihe na-adị ụkọ kemgbe ọtụtụ afọ, ya mere ...."

"Nwa m nwaanyị, naanị ihe m chọrọ ịma n'aka gị bụ oke ego ole ọrụ ahụ bụ nke nwa m nwoke tinyere, okwu agwụ."

Ebe niile dara oke jụụ. N'ebe dị ka ọ tere aka, Petronella nụrụ ka Chimaobi nabatara Catalina, onye otu nke atọ nke so njem ọrụ ụgbọ ala ha.

"Amai Paida , Ị nụghị ihe m kwuru?" olu mkpagbu ọjọọ nke nne di ya kachapụrụ nkịtị nke di ya n'obi wee dọghachita ya ebe ọ nọ. "Ego ole ka Baba VaPaida nyere ndị mụrụ gị maka ogwe ọkụ anyanwụ ha?!"

"Amai, ebee kwanụ ka nke a si abịa?" Petronella ji uche mara na Chimaobi na Catalina leliri anya ka ha nụrụ ụda akwa dị n'olu ya.

“O si n’ezinaụlọ ndị ike omume di gị gwụrụ!” Gogo VaPaida kwuru . Ezinụlọ nke ọ na-ewute na ị nweghị ike ịchịkọta di gị. Ezinụlọ nke na-ewe iwe maka anyị ahụla ugbu a ihe mere i ji hapụ ya ka ọ gbaghapụ ọrụ ya n'ebe anyị nọ dị ka ọkpara; maka na nkwado gị ka dị n’ebe ndị nke gị nọ!”

Mgbe Gogo VaPaida malitere etu a, ọ ka mma ịhapụ ya ka ọ kwuru na-aga.
"Nwa m nwanyị, a gwara m Baba VaPaida na ike agwụla ụmụnne ya ebe a maka na ọ naghị arụ ọrụ ya n'ime ezinụlọ a! Ego ọ na-ezitere anyị anaghị ezu. Ọ dịghị mma ebe Gulliver nọ. Nwunye ya nwere oke ndidi, o kpesanubeghi maka ego ọ na-eri n’isi anyị. ”

Ma mụnwa, Petronella kwuru n’uche ya.

VaPaida kwuru , "Di gị na-agwa anyị na ya enwebeghị ike nweta ọrụ zuru oke ọ ga-eji nwee ike izipukwu ego." Mana, mgbe m hụrụ ogwe anyanwụ n'elu ụlọ nne na nna gị, ị nwere ike ịdakwasị helikopta na ndị ahụ, achọpụtara m na ihe mere o ji na-eleghara anyị anya bụ n'ihi na ọ na-ebu ezinụlọ gị ugbu a! Ị che na ọ dị mma? Nwa m nwoke na-arụ ọrụ dị ka nkịta ka ọ kpọfeta gị na UK, ị nweghị ike ichere nkeji ise tupu ịmalite izigara ndị ezinụlọ gị pound! Eee, ha bi na Chitungwiza, mana ndụ na-esiri onye ọbụla nọ na Zimbabwe ike. Kedu ihe ị chere na ndị agbataobi gị na-ekwu mgbe ha hụrụ ogwe ọkụ anyanwụ ọhụrụ gị na-egbuke egbuke, mana ndị ọgọ gị nọ na mkpa? Kedụ otú nke ahụ si egosipụta gị dị ka nwunye nwa?”

Okwu a rere ya gburugburu ka ọkụ, o wee chekwaa ha na ndị ọzọ. E mesịa, mgbe ọ lọtara n’ụlọ, ọ na-ebe ezigbo ákwá. Ọ beela ákwá ọtụtụ ugboro n’oge gara aga, ọ dịkwa ka ọ ga-ebe akwa ọzọ n’ọdịnihu. Naanị ihe ga-eme ka ịta ahụhụ a kwe odidi bụ na Greg, Baba VaPaida , anaghị anabata ndị ikwu ya ma ọ bụ na-anọpụ iche mgbe ha wakporo ya. Oge dị etua anaghị emekarị maka na ọ naghị agwa ya ma ọ mee. Ma ọ nụla ka ọ na-eti mkpu na igwe ntị, ọbụnadị nne ya, mgbe ha kpọrọ ịkpesa.

Chukwu mere, ọ bụrụ na Gogo VaPaida ekwuchaala. “Nwa m nwanyị, ị bụ nne dị ka m, ya mere na ọ bụrụgodị na okwu m na-ewe gị iwe, ị ghọtara ihe mgbu so ha. Naanị ihe m chọrọ bụ ka nwa m nwoke cheta nwaanyị ahụ bu ya ọnwa iteghete, mụọ ya ma ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ mgbe ọ na-amụ ya, ma zụlite ya mgbe ọ na-anagide nna ya na ndị ikwu ya. Chineke Nke na-ele anya, na ndi nọ n'ala na-ele anya. Mgbe emepechara gị ụzọ ka ị banye UK, ha ga-ewe iwe ma ị kwụghachi ha etu a. Achọghị m ịkpọku iwe di etua, n'ihi ya, anaghị m eme mkpesa, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-akarị akarị. Achọrọ m naanị US$200 maka ọrụ ọhụrụ m. Di gị na-eze okwu ahụ, enweghịzị m ndidi.”

"Aga m agwa ya okwu ma m laruo ụlọ, Amai," ka Petronella ji ike ọgwụgwụ kwuo. Ụgwọ ekwentị/Brọdband ga-echere izu ọzọ, mana e nwere ihe egwu na a ga-ewepụ ha tupu mgbe ahụ. Nke ahụ ga-emetụta ọrụ Greg, ma ọ dịghị ihe ọ pụrụ ime banyere ya ugbua. O nwere ike ijikọ ekwentị ya na kọmpụta ya, dị ka o si mee oge ikpeazụ. N'oge ikpeazụ ahụ, Greg nwa okpuru enweghị ike imezu oge e nyere, ohere ahụ agafee. Ebe ọ bụ na arịrịọ si ụlọ ka nọgidere, o nweghị ike ịkwụ ụgwọ oji wee ruo mgbe ihe fọrọ nke nta ka otu afọ gachara.

"Eee, gwa ya okwu, maka na a chọrọ m ịhụ mgbanwe! Eche m na nke a gị na Paida sonyere ya n'afọ gara aga, ihe ga-akawanye mma, mana ọ ka njọ! Daalụ maka ịge ntị, nwa m nwanyị. Agaghị m ejide gị ọzọ, ụgbọ ala ma ọ bụ ụgbọ oloko ga-ahapụ gị."

Petronella kelekwara Greg ọzọ maka inye ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ikwu ha ọbụla na ọ zụtaara ya ụgbọala.

"Ọ dị mma, Amai," ka Petronella kwuru, na-asụ ude ike ọgwụgwụ. "Nwee ezigbo ụbọchị."

Ka ọ gbanyuru ekwentị, ọ dakwasịrị n'oche ya ma hazie onwe ya.

"Ọ’ụ ozi sitere n'ụlọ, querida hermana?" Catalina jụrụ, ka ọ dabeere n'oche azụ iji bitu Petronella aka nkasi obi n'ubu.

N'etiti akwa obube, nke sokwa mkpọrị egwu na iwe, na okwu na-akụda mmụọ n'asụsụ bekee, Igbo na Spanish sitere na ụmụ nwaanyị abụọ ndị ọzọ, Petronella kọọrọ ha maa mkparịta ụka ọ ka nwetọpụrụ. Ebe ọ bụ na ọ dịtụbeghị mgbe ya na onye Naijiria na Honduran kerịta ụdị akụkọ ndụ a, Petronella nyere ha akụkọ azụ so okwu a. Ọ zutere Gregory n'ịntanetị mgbe ọ bi na Harare. Ọ bịarutere ịhụ ya, ọ tụụrụ ime Paidamoyo . Otú ọ dị, ha enweghị ike imezu ihe a chọrọ n'ụzọ ego nke visa di na nwunye. Petronella nwetara ọrụ na gọọmenti Namibia ma kwaga Windhoek, bụ ebe a mụrụ Paida . Gregory na-efeta ịbịa hụ ya mgbe ọbụla o nwere ike. Sally, bụ otu n’ime ụmụnne ya nwaanyị, bịa letachaa ya ma ga kọọrọ ezinụlọ ha nọ na Zimbabwe na Gregory na-edebe Petronella n’otu ọnụ ụlọ dị oké ọnụ. Ha na-eti mkpu na ozi WhatsApp nke mechara ruo ya ntị mgbe ọ na-enweghị ike imeghari ikike ọrụ ya wee laghachi Zimbabwe. Gregory malitere ọrụ nlekọta, na, mgbe otu afọ na ọkara gachara, n'ikpeazụ nweta ego n'ụlọ akụ iji mezuo ihe achọrọ maka ikikere ngafeta.

"Ọ bụrụ nnọọ na ha maara na ihe ha na-enwetakarị n'aka ya sitere na aka nke m," Petronella kwuru. "Mgbe m bịara, Greg kwụsịrị ọrụ nlekọta ka o wee lekwasị anya na ederede ya."

"Ya bụ na, ọ bụghị ya wetaara ndị mụrụ gị ogwe ọkụ anyanwụ ọma ahụ?" Chimaobi kwuru.

"Mba, ego ahụ sitere na ụgwọ ezumike nka nna m mafodoro, bụ nke mechara pụta n'ọnwa gara aga," Petronella kwuru. "Mana ndị ezinụlọ Greg che na ihe ịrịba ama ọbụla nke ọganihu na ndị ezinụlọ m na-esi n'aka nwa ha nwoke na UK!"

Catalina tamuuru n'ime onwe ya n'asụsụ Spanish, ebe Chimaobi fegharịrị isi ya n'obi ebere. "Ụtụ isi ojii bụ ihe n'ezie, oh!"

"Ụtụ isi ojii?" Katalina kwuru.

"Ọ’ụ ihe anyị na-akpọ ya mgbe a na-ahụ otu onye a kpaala ego, a na-echekwube ya ka ọ kwado ndị ikwu niile na-abaghị uru, n'agbanyeghị otú ndị ikwu ya si dị anya," Chimaobi kọwara. “O nwere akụkụ dị mma; enwere ike ịhụ ya dị ka ụkpụrụ ndị Africa na-egosi na ezinụlọ na-elebara ibe ha anya.”

"Oh, anyị nwere otu ihe ahụ na Honduras," Catalina kwuru. "Ma ị maara, akụkụ nke nna nna anyị bụ Africa! Mana anyị nwekwara ya na omenala ụmụ amaala, yana na nke Europe."

"Ọghọ m dị nke dị n’usoro ahụ bụ na ọ nwere ike ịmepụta usoro nke ịdabere na ikike," ka Chimaobi kwuru . "N'ebe ọzọ m na-arụ ọrụ mgbe ụfọdụ, e nwere otu nwaanyị, echere m na ọ bụ onye Zimbabwe dị ka gị, 'Nella. Ọ bịara na ngwụcha afọ iri na ụma ya, ọ nọ n'afọ iri anọ ya ugbua. Naanị ihe ọ rụrụ n’ime iri afọ abụọ gara aga bụ ọrụ ma ọ bụ ịga ụlọụka. O nweghị di ma ọ bụ enyi nwoke, na-agbazite ụlọ kansụl. Site n'ego o zigagoro ụlọ, ụmụnne ya nwoke ise alụwo ọtụtụ alụmdi na nwunye n'otu n'otu. Ọ na-elekọta ihe dị ka ụmụaka iri na asaa, abụọ na mahadum dị na Malaysia. N'afọ iri abụọ ọzọ, ọ ga-akacha nká ịrụ ọrụ. Ọ gaghị enwe ihe ọ ga-egosi kemgbe ọtụtụ afọ ọ nọrọ ebe a, ọ gaghị abịkwa nso n’ibelata ịda ogbenye n'ụlọ ya.”

Petronella kwuru, "Ndị ọgọ m na-eme nke ọma. "Gulliver, onye na-esote Greg, bụ onye ọchụnta ego na-eme nke ọma. Otu n’ime ụmụnna nwanyị ahụ bi na Dubai, nke ọzọ bi na Sandton, Johannesburg. Ụmụnna abụọ ndị ọzọ, otu n’ime ha nọ na Amerika, nke ọzọ nọkwa n’Australia.”

"Yaa, gịnị kpatara o ji enye ha nsogbu na di gị na-ezigara ndị mụrụ gị ego?" Catalina jụrụ.

Petronella kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị ndị mụrụ m, mụ na nwa anyị nwaanyị sokwa. “Greg n'onwe ya chịkọtara ya nke ọma; Ezinụlọ anaghị ekwe ka ndị nwoke Zimbabwe hụ nwunye ha n'anya. Ọ bụ ihe niile gbasara njikwa. Ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ n’ebe ọzọ, ọ bụghịzi ha ga-achị ya.”

Chimaobi kwuru, "Ị nwere chi ọma na Greg enyeghị ha ohere ahụ."

Petronella kwuru, sị: "Ọ sị na ya hụrụ ka o siri ghasaa nna ya, ọ wee kwee nkwa na ya agaghị ekwe ka ndị ezinụlọ ya nwee ike dị otú ahụ n'alụmdi na nwunye nke ya."

"Ọ bụrụ na ọ nọrọ otu ahụ, ị ga-adị mma," Catalina kwuru. “Anyị nwekwara ndị nna ukwu na obodo anyị. Amụtala m ịtụkwasị obi na Jorgé ka o saa ha okwu!”

Chimaobi kwuru, "Anyị niile nwere mgba ahụ na ezinụlọ anyị . “Ị nọghị naanị gị, nwanne m nwaanyị, oh! Mee ka obi dị gị mma, bulaa anyị ụlọ ugbua. Nke a bụ ndụ. Lee, ọ dị gị mma ugbua karịa mgbe ị malitere ịgwa anyị maka ọnọdụ gị!”

Petronella dị ka à ga-asị na ọ wụpụrụ ibu dị arọ na mkpụrụ obi ya. Ụtụ isi ojii ga-abụ ihe nke ndụ ọgbọ ya mgbe niile. A ga-enwe ọtụtụ oku ọjọọ dị ka nke ọ natara n'aka nne di ya. Ahụ dị ya ka onye agbara ume, Petronella si n'ọdụ ụgbọ ala ahụ pụta. Ọ ka gbara ọchịchịrị, ma ndò na-acha odo odo na ọla edo jupụtara na mbara igwe dị n'ebe ọwụwa anyanwụ.

Mgbe o ji rute n'ụlọ, Greg akpọrọla Paida gaa ụlọ akwụkwọ. Petronella kwọsara mmiri n’ahụ, wee richaa nri ụtụtụ ọsịsọ. Ọ na-eri nri mgbe ọ nụrụ ka ọ batara n’ime ụlọ. Ọ ga-agbagote n’ụlọ elu ka ọ chọọ ya. "Anọ m na useekwu, Obi m!" ọ kpọrọ.

Ọ kwụ n'ọnụ ụzọ, nwee ihu ọchị mmeri, anya ya na-egbuke egbuke. Ọ hụla ụdị anya ahụ mbụ. Ọtụtụ afọ gara aga, n'ụlọ ha dị na Windhoek. Ọ natara ozi na otu onye nkwusa chọrọ ịzụrụ akwụkwọ akụkọ ya. "La Noire kpọrọ n'abalị ụnyaahụ," ka o kwuru.

La Noire Hume bụ onye nnọchi anya agụmagụ ya bi na Amerika. Petronella nwere mmetụta na-efegharị efegharị n'afọ ya. Oge ikpeazụ ọ nwere mmetụta ntugharị dị etu ahụ, ọ hụla okwu ndị a ngwa gị maka Visa Mgbakọ Ezinụlọ agaara nke ọma …. N’ime ozi ikuku.

"Otu onye nkwusa, echefuru m aha ahụ, na-enye narị puku dollar abụọ tupu oge eruo ụgwọ mbọ agbara maka akwụkwọ He’s not Dead Yet, La Noire na-eche na ọ nwere ike nweta ire ere Europe dị iche!" Gregory kwuru. "Ọ na-echekwa na n'ime afọ na-edubanye n'afọ na-abịa, ọ nwere ike ime ka ndị mmadụ na-ekiri ihe nkiri ahụ. O zitelarị nkwekọrịta ahụ."

Ọ nọ na-ebe akwa ma na-achị ọchị mgbe Greg kuuru ya n'aka ya, obi ndajụ na ọṅụ ha na-ejikọta ọnụ. "Anyị agaghị agwa onye ọ bụla ugbu a, obi m," ka o kwuru.

Petronella dọlara isi ya azụ, ma legide ya anya, ọnọdụ mgbagwoju anya n'ihu ya.

Gregory kwuru, sị: “E nwere otu akụkọ n'akwụkwọ akụkọ gbasara azụmahịa nke Gulliver. “Ọ dị ka nwanne m nwa okpuru nọ na nsogbu nwa oge gara aga. Ọ dịghị onye hụrụ mkpa dị n’ịgwa m, n’ihi na ọ dịghị onye tụrụ anya na m ga-enwe ike ime ihe ọbụla banyere ya.” Ọ chịrị ọchị. "Gulliver chọrọ narị puku dollar abụọ nke America n'oge na-adịghị anya ma ọ bụ onye uweojii ga-etinye ihe onwunwe ya, gụnyere ụlọ ezinaụlọ nne anyị tinyere n'aha ya ka o nwee ike ịnweta ego n'aka ya. Ha chere na amaghị m maka obere nhazi ahụ. narị puku dollar abụọ, ego na-abịara

anyị, bụ ihe ha chọrọ ọsịsọ! Nke a agaghị abụ naanị ụtụ isi ojii maka ha, nke a ga-abụ ozi chioma na-abata!”

Ezi nwunye nwa di n’ime ya malitere ịjụ ya ma ha chọrọ ihe niile ozugbo, ma eleghị anya ọ bụrụ na ha ezipụ ụfọdụ n'ime ya ka ọ gbapụta ezinụlọ ahụ, nke ahụ ga-eme ka ha niile bịaruo nso. Ihe ọ na-agwaghị ya, ihe ọ maara na ọ gaghị aghọta bụ na nke a bụ ohere iji gosi nne di ya na ya nọ n'otu otu, na ọ nwere ike ịtụkwasị anya na ya ịdebe Greg n'ahịrị. N'ezie, ọ bụrụ na ọ ga-eme ka o kweta iziga nnukwu ego a, ha ga-emecha nabata ya dị ka onye òtù ezinụlọ?

Greg meghere ọnụ ya ịzaghachi, ha abụọ nwee mmetụta na-ama jijiji n'akpa uwe elu ya dị n'ime akpa ekwentị ya na-ada ụda dị egwu. O wee tinye aka n’akpa ya, setịpụ ya ka ọ hụ onye na-akpọ ya.

Gogo VaPaida.

NJEDEBE

"Ọ bụrụ nnọọ

 
Masimba Musodza

A mụrụ Masimba Musodza na Zimbabwe, ma o bie ọtụtụ oge ndụ ya ka okenye na United Kingdom. Akụkọ ya ndị dị mkpirikpi, bụ nke ka ukwuu n'ụdị akụkọ ifo, apụtala n'akwụkwọ akụkọ oge na akụkọ ihe mere eme gburugburu ụwa. Ọ deela akwụkwọ akụkọ abụọ na akwụkwọ akụkọ n'asụsụ mbụ ya, ChiShona. Nchịkọta akụkọ akụkọ ifo sayensị ya, The Junkyard Rastaman & Other Stories , ka ebipụtara na 2020. Masimba na-edekwa maka ogbo na ihuenyo. Ọ bi na Middlesbrough, North East England.

Return